Abụ Ọma 89:9
Psalms 89:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.
Psalms 89:9 in English
Psalms 89:9 · Berean Standard Bible
You rule the raging sea; when its waves mount up, You still them.
Context
7Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu;
ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu. 8O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị?
Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu. 9Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;
mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ. 10Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;
jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. 11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,
ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.