Native Bible

Psalms 89:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.

Psalms 89:10 in English

Psalms 89:10 · Berean Standard Bible

You crushed Rahab like a carcass; You scattered Your enemies with Your mighty arm.

Context

8O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu. 9Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ. 10Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. 11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. 12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.