Abụ Ọma 89:10
Psalms 89:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.
Psalms 89:10 in English
Psalms 89:10 · Berean Standard Bible
You crushed Rahab like a carcass; You scattered Your enemies with Your mighty arm.
Context
8O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị?
Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu. 9Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;
mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ. 10Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;
jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. 11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,
ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. 12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;
Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.