Abụ Ọma 89:12
Psalms 89:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.
Psalms 89:12 in English
Psalms 89:12 · Berean Standard Bible
North and south You created; Tabor and Hermon shout for joy at Your name.
Context
10Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;
jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. 11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,
ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. 12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;
Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị. 13Aka gị ka e mejupụtara nʼike;
aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu. 14Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị;
ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.