Native Bible

Psalms 89:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.

Psalms 89:13 in English

Psalms 89:13 · Berean Standard Bible

Mighty is Your arm; strong is Your hand. Your right hand is exalted.

Context

11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. 12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị. 13Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu. 14Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị. 15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.