Abụ Ọma 89:13
Psalms 89:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.
Psalms 89:13 in English
Psalms 89:13 · Berean Standard Bible
Mighty is Your arm; strong is Your hand. Your right hand is exalted.
Context
11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,
ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. 12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;
Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị. 13Aka gị ka e mejupụtara nʼike;
aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu. 14Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị;
ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị. 15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ,
ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.