Native Bible

Psalms 89:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.

Psalms 89:15 in English

Psalms 89:15 · Berean Standard Bible

Blessed are those who know the joyful sound, who walk, O LORD, in the light of Your presence.

Context

13Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu. 14Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị. 15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị. 16Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; ha na-aṅụrị nʼezi omume gị. 17Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.