Native Bible

Psalms 85:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị kwụsịla iwe oke iwe gị, I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.

Psalms 85:3 in English

Psalms 85:3 · Berean Standard Bible

You withheld all Your fury; You turned from Your burning anger.

Context

1O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma; i nyeghachila Jekọb akụnụba ya. 2I gbagharala ajọ omume ndị gị, kpuchikwaa mmehie ha niile. Sela 3Ị kwụsịla iwe oke iwe gị, I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa. 4Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ. 5Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe: Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.