Native Bible

Psalms 84:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya.

Psalms 84:9 in English

Psalms 84:9 · Berean Standard Bible

Take notice of our shield, O God, and look with favor on the face of Your anointed.

Context

7Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn. 8O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb. 9Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya. 10Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume. 11Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ* na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.