Native Bible

Psalms 84:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb.

Psalms 84:8 in English

Psalms 84:8 · Berean Standard Bible

O LORD God of Hosts, hear my prayer; give ear, O God of Jacob. Selah

Context

6Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe, ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta; mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.* 7Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn. 8O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb. 9Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya. 10Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.