Native Bible

Psalms 84:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe, ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta; mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.*

Psalms 84:6 in English

Psalms 84:6 · Berean Standard Bible

As they pass through the Valley of Baca,* they make it a place of springs; even the autumn rain covers it with pools.*

Context

4Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Sela 5Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem. 6Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe, ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta; mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.* 7Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn. 8O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.