Abụ Ọma 84:4
Psalms 84:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Sela
Psalms 84:4 in English
Psalms 84:4 · Berean Standard Bible
How blessed are those who dwell in Your house! They are ever praising You. Selah
Context
2Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba,
ịbata nʼogige Onyenwe anyị;
mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu
na-achọ Chineke dị ndụ. 3Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi;
eleke achọtakwarala onwe ya akwụ,
ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya,
nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị,
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m. 4Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ;
ha na-eto gị mgbe niile. Sela 5Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị,
ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem. 6Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe,
ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta;
mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.