Abụ Ọma 84:3
Psalms 84:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m.
Psalms 84:3 in English
Psalms 84:3 · Berean Standard Bible
Even the sparrow has found a home, and the swallow a nest for herself, where she places her young near Your altars, O LORD of Hosts, my King and my God.
Context
1Lee ka ebe obibi gị sị maa mma,
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile! 2Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba,
ịbata nʼogige Onyenwe anyị;
mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu
na-achọ Chineke dị ndụ. 3Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi;
eleke achọtakwarala onwe ya akwụ,
ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya,
nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị,
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m. 4Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ;
ha na-eto gị mgbe niile. Sela 5Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị,
ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.