Native Bible

Psalms 84:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.

Psalms 84:10 in English

Psalms 84:10 · Berean Standard Bible

For better is one day in Your courts than a thousand elsewhere. I would rather be a doorkeeper in the house of my God than dwell in the tents of the wicked.

Context

8O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb. 9Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya. 10Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume. 11Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ* na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ. 12O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi. 84:6 Na-ewere ọdọ mmiri kpuchie ya 84:11 Aịz 60:19,20; Mkp 21:23

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.