Abụ Ọma 80
Psalms 80 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel,
gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ.
Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim,
nwupụta Ìhè 2nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase.*
Kpọtee ịdị ike gị,
bịa zọpụta anyị. 3O Chineke, kpọghachi anyị azụ,
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike ịzọpụta anyị. 4O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile
ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ
megide ekpere ndị gị? 5I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri;
i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ. 6I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị,
ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị. 7O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ,
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike ịzọpụta anyị. 8I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị;
ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya. 9Ị sụchaara ya ala,
mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile. 10Ndo ya kpuchiri ugwu niile,
alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida. 11Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri
wasaakwa ume ya ruo osimiri.* 12Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile
si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya? 13Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya,
ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri. 14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ!
Letakwa osisi vaịnị a, 15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ,
ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị. 16E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya;
mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi. 17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị,
nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị. 18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ;
tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị. 19Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike zọpụta anyị.
80:2 Ebo atọ ndị a bụ ụmụ ụmụ Rechel, bụ ndị soo igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼazụ mgbe ndị Izrel na-ala nʼala nkwa ahụ.
80:11 Eleghị anya osimiri ndị a bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis. Nʼoge ọchịchị eze Devid na Solomọn, alaeze ha kwụsịrị nʼosimiri abụọ ndị a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.