Native Bible

Psalms 80:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.

Psalms 80:17 in English

Psalms 80:17 · Berean Standard Bible

Let Your hand be upon the man at Your right hand, on the son of man You have raised up for Yourself.

Context

15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị. 16E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya; mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi. 17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị. 18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị. 19Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike zọpụta anyị. 80:2 Ebo atọ ndị a bụ ụmụ ụmụ Rechel, bụ ndị soo igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼazụ mgbe ndị Izrel na-ala nʼala nkwa ahụ. 80:11 Eleghị anya osimiri ndị a bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis. Nʼoge ọchịchị eze Devid na Solomọn, alaeze ha kwụsịrị nʼosimiri abụọ ndị a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.