Abụ Ọma 81
Psalms 81 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ,
tikusie Chineke Jekọb mkpu ike! 2Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu,
kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une. 3Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ,
na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị; 4nke a bụ iwu dịrị Izrel,
ụkpụrụ Chineke nke Jekọb. 5O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef
mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt.
Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị: 6“Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha;
aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ. 7Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu,
azara m unu site nʼegbe eluigwe;
anwara m unu na mmiri nke Meriba. Sela 8“Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị,
a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel! 9Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu;
unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ. 10Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,
onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt.
Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya. 11“Ma ndị m ekweghị ige m ntị.
Izrel emekwaghị dịka m gwara ha. 12Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha,
ka ha soro nchepụta nke echiche ha. 13“Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị,
a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile. 14Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha.
Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile. 15Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ.
Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi. 16Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ;
aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.