Native Bible

Psalms 81:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha.

Psalms 81:12 in English

Psalms 81:12 · Berean Standard Bible

So I gave them up to their stubborn hearts to follow their own devices.

Context

10Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya. 11“Ma ndị m ekweghị ige m ntị. Izrel emekwaghị dịka m gwara ha. 12Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha. 13“Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile. 14Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.