Abụ Ọma 80:9
Psalms 80:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị sụchaara ya ala, mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.
Psalms 80:9 in English
Psalms 80:9 · Berean Standard Bible
You cleared the ground for it, and it took root and filled the land.
Context
7O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ,
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike ịzọpụta anyị. 8I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị;
ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya. 9Ị sụchaara ya ala,
mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile. 10Ndo ya kpuchiri ugwu niile,
alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida. 11Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri
wasaakwa ume ya ruo osimiri.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.