Native Bible

Psalms 78:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.

Psalms 78:9 in English

Psalms 78:9 · Berean Standard Bible

The archers of Ephraim turned back on the day of battle.

Context

7Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile. 8Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya. 9Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha. 10Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke. Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị. 11Ha chefuru ihe o mere, ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.