Abụ Ọma 78:8
Psalms 78:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.
Psalms 78:8 in English
Psalms 78:8 · Berean Standard Bible
Then they will not be like their fathers, a stubborn and rebellious generation, whose heart was not loyal, whose spirit was not faithful to God.
Context
6ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya,
ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị,
ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha. 7Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha,
ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche.
Ha ga-edebekwa iwu ya niile. 8Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha,
ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike;
ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ,
ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya. 9Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha,
chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha. 10Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke.
Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.