Native Bible

Psalms 78:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.

Psalms 78:27 in English

Psalms 78:27 · Berean Standard Bible

He rained meat on them like dust, and winged birds like the sand of the sea.

Context

25Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri. 26O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda. 27O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri. 28O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha. 29Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.