Native Bible

Psalms 78:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.

Psalms 78:29 in English

Psalms 78:29 · Berean Standard Bible

So they ate and were well filled, for He gave them what they craved.

Context

27O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri. 28O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha. 29Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ. 30Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ, anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ, 31mgbe iwe Chineke biliri imegide ha; o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha, tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.