Native Bible

Psalms 75:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, ọ bụ m na-ejidesi ogidi* ya ike ka o guzo chịm. Sela

Psalms 75:3 in English

Psalms 75:3 · Berean Standard Bible

When the earth and all its dwellers quake, it is I who bear up its pillars. Selah

Context

1Anyị na-eto gị, O Chineke. Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso. Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche. 2Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka. Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi. 3Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, ọ bụ m na-ejidesi ogidi* ya ike ka o guzo chịm. Sela 4Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ, nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi* unu elu. 5Unu ewelila mpi unu megide eluigwe; unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.