Native Bible

Psalms 74:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.

Psalms 74:18 in English

Psalms 74:18 · Berean Standard Bible

Remember how the enemy has mocked You, O LORD, how a foolish people has spurned Your name.

Context

16Ehihie na abalị bụ nke gị. I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike. 17Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị. 18O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo. 19Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi. 20Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.