Native Bible

Psalms 74:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.

Psalms 74:20 in English

Psalms 74:20 · Berean Standard Bible

Consider Your covenant, for haunts of violence fill the dark places of the land.

Context

18O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo. 19Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi. 20Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a. 21Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere; ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị. 22O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe. Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.