Abụ Ọma 68:29
Psalms 68:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem, ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche.
Psalms 68:29 in English
Psalms 68:29 · Berean Standard Bible
Because of Your temple at Jerusalem kings will bring You gifts.
Context
27Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha,
lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda
na nke Zebụlọn na Naftalị. 28O Chineke, kpọlite ike gị;
mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ. 29Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem,
ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche. 30Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba,
igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile.
Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha.
Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha. 31Ndị nnọchi anya obodo, ga-esite nʼIjipt bịa,
Kush ga-etinye onwe ya nʼokpuru Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.