Abụ Ọma 68:27
Psalms 68:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha, lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda na nke Zebụlọn na Naftalị.
Psalms 68:27 in English
Psalms 68:27 · Berean Standard Bible
There is Benjamin, the youngest, ruling them, the princes of Judah in their company, the princes of Zebulun and of Naphtali.
Context
25Ndị na-abụ abụ nọ nʼihu, ndị na-eti egwu, na-eso ha nʼazụ;
ụmụ agbọghọ na-akpọ ụbọ sokwa ha. 26Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ;
toonu Onyenwe anyị nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel. 27Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha,
lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda
na nke Zebụlọn na Naftalị. 28O Chineke, kpọlite ike gị;
mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ. 29Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem,
ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.