Abụ Ọma 68:28
Psalms 68:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Chineke, kpọlite ike gị; mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ.
Psalms 68:28 in English
Psalms 68:28 · Berean Standard Bible
Summon Your power, O God;* show Your strength, O God, which You have exerted on our behalf.
Context
26Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ;
toonu Onyenwe anyị nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel. 27Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha,
lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda
na nke Zebụlọn na Naftalị. 28O Chineke, kpọlite ike gị;
mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ. 29Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem,
ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche. 30Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba,
igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile.
Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha.
Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.