Abụ Ọma 68:19
Psalms 68:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị, Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela
Psalms 68:19 in English
Psalms 68:19 · Berean Standard Bible
Blessed be the Lord, who daily bears our burden, the God of our salvation. Selah
Context
17Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha;
ha dịkwa puku kwụrụ puku;
Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya. 18Mgbe i rigoro gaa nʼelu,*
i duuru ndị a dọtara nʼagha*;
ị natara onyinye dị iche iche nʼaka ndị mmadụ,
ọ bụladị nʼaka ndị na-enupu isi,
ka gị, O Onyenwe anyị Chineke, biri nʼebe ahụ. 19Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị,
Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela 20Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta;
mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. 21Nʼezie, Chineke ga-egwepịa isi ndị iro ya niile,
isi ndị niile na-aga nʼihu ibi ndụ mmehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.