Abụ Ọma 68:17
Psalms 68:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha; ha dịkwa puku kwụrụ puku; Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya.
Psalms 68:17 in English
Psalms 68:17 · Berean Standard Bible
The chariots of God are tens of thousands— thousands of thousands are they; the Lord is in His sanctuary as He was at Sinai.*
Context
15Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu,
ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche. 16Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworo
nʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa,
ebe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi? 17Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha;
ha dịkwa puku kwụrụ puku;
Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya. 18Mgbe i rigoro gaa nʼelu,*
i duuru ndị a dọtara nʼagha*;
ị natara onyinye dị iche iche nʼaka ndị mmadụ,
ọ bụladị nʼaka ndị na-enupu isi,
ka gị, O Onyenwe anyị Chineke, biri nʼebe ahụ. 19Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị,
Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.