Native Bible

Psalms 68:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu, ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche.

Psalms 68:15 in English

Psalms 68:15 · Berean Standard Bible

A mountain of God is Mount Bashan; a mountain of many peaks is Mount Bashan.

Context

13Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ, nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie, jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya. 14Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a, ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon. 15Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu, ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche. 16Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworo nʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa, ebe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi? 17Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha; ha dịkwa puku kwụrụ puku; Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.