Native Bible

Psalms 68:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a, ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon.

Psalms 68:14 in English

Psalms 68:14 · Berean Standard Bible

When the Almighty * scattered the kings in the land, it was like the snow falling on Zalmon.

Context

12ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa; ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu. 13Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ, nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie, jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya. 14Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a, ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon. 15Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu, ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche. 16Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworo nʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa, ebe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.