Abụ Ọma 67
Psalms 67 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị,
ma mee ka ihu ya chakwasị anyị,* Sela 2Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa,
marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. 3Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;
ka mmadụ niile too gị. 4Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ,
nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ,
na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela 5Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;
ka mmadụ niile too gị. 6Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya,
Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị. 7Chineke ga-agọzi anyị,
nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
67:1 Ọnụ 6:25
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.