Native Bible

Psalms 66:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya;

Psalms 66:8 in English

Psalms 66:8 · Berean Standard Bible

Bless our God, O peoples; let the sound of His praise be heard.

Context

6O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ,* ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee*; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya. 7Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela 8Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya; 9O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ. 10Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị; ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.