Native Bible

Psalms 65:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị, ị gbaghara anyị njehie anyị niile.

Psalms 65:3 in English

Psalms 65:3 · Berean Standard Bible

When iniquities prevail against me, You atone for our transgressions.

Context

1I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn; ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị, 2O gị onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,* 3Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị, ị gbaghara anyị njehie anyị niile. 4Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara, ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị! E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị, mee ka afọ ju anyị. 5O Chineke, Onye nzọpụta anyị, i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị, ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa, na osimiri niile dị ebe dị anya,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.