Native Bible

Psalms 65:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara, ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị! E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị, mee ka afọ ju anyị.

Psalms 65:4 in English

Psalms 65:4 · Berean Standard Bible

Blessed is the one You choose and bring near to dwell in Your courts! We are filled with the goodness of Your house, the holiness of Your temple.

Context

2O gị onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,* 3Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị, ị gbaghara anyị njehie anyị niile. 4Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara, ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị! E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị, mee ka afọ ju anyị. 5O Chineke, Onye nzọpụta anyị, i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị, ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa, na osimiri niile dị ebe dị anya, 6onye ji ike ya kpụọ ugwu niile, ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.