Abụ Ọma 65:5
Psalms 65:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Chineke, Onye nzọpụta anyị, i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị, ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa, na osimiri niile dị ebe dị anya,
Psalms 65:5 in English
Psalms 65:5 · Berean Standard Bible
With awesome deeds of righteousness You answer us, O God of our salvation, the hope of all the ends of the earth and of the farthest seas.
Context
3Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị,
ị gbaghara anyị njehie anyị niile. 4Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara,
ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị!
E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị,
mee ka afọ ju anyị. 5O Chineke, Onye nzọpụta anyị,
i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị,
ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa,
na osimiri niile dị ebe dị anya, 6onye ji ike ya kpụọ ugwu niile,
ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha, 7onye mere ka ụda olu oke osimiri niile
na ụda olu ebili mmiri,
na ọgbaaghara mba niile deere duu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.