Abụ Ọma 65:7
Psalms 65:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
onye mere ka ụda olu oke osimiri niile na ụda olu ebili mmiri, na ọgbaaghara mba niile deere duu.
Psalms 65:7 in English
Psalms 65:7 · Berean Standard Bible
You stilled the roaring of the seas, the pounding of their waves, and the tumult of the nations.
Context
5O Chineke, Onye nzọpụta anyị,
i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị,
ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa,
na osimiri niile dị ebe dị anya, 6onye ji ike ya kpụọ ugwu niile,
ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha, 7onye mere ka ụda olu oke osimiri niile
na ụda olu ebili mmiri,
na ọgbaaghara mba niile deere duu. 8Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile,
nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada,
ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ. 9Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri;
ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma.
Isi iyi Chineke adịghị ata ata,
nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi,
nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.