Abụ Ọma 65:8
Psalms 65:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile, nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada, ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ.
Psalms 65:8 in English
Psalms 65:8 · Berean Standard Bible
Those who live far away fear Your wonders; You make the dawn and sunset shout for joy.*
Context
6onye ji ike ya kpụọ ugwu niile,
ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha, 7onye mere ka ụda olu oke osimiri niile
na ụda olu ebili mmiri,
na ọgbaaghara mba niile deere duu. 8Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile,
nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada,
ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ. 9Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri;
ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma.
Isi iyi Chineke adịghị ata ata,
nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi,
nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị. 10Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị;
ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.