Native Bible

Psalms 59:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m. Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m!

Psalms 59:4 in English

Psalms 59:4 · Berean Standard Bible

For no fault of my own, they move swiftly to attack me. Arise to help me, and take notice.

Context

2Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe, zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ. 3Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m. 4Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m. Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m! 5Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gị onye bụ Chineke nke Izrel, kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela 6Nʼanyasị, ha na-alaghachi, na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.