Abụ Ọma 59:5
Psalms 59:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gị onye bụ Chineke nke Izrel, kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela
Psalms 59:5 in English
Psalms 59:5 · Berean Standard Bible
O LORD God of Hosts, the God of Israel, rouse Yourself to punish all the nations; show no mercy to the wicked traitors. Selah
Context
3Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ!
Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m,
o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m. 4Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m.
Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m! 5Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile,
gị onye bụ Chineke nke Izrel,
kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ;
e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela 6Nʼanyasị, ha na-alaghachi,
na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta
mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 7Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta,
okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha,
ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.