Native Bible

Psalms 59:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gị onye bụ Chineke nke Izrel, kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela

Psalms 59:5 in English

Psalms 59:5 · Berean Standard Bible

O LORD God of Hosts, the God of Israel, rouse Yourself to punish all the nations; show no mercy to the wicked traitors. Selah

Context

3Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m. 4Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m. Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m! 5Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gị onye bụ Chineke nke Izrel, kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela 6Nʼanyasị, ha na-alaghachi, na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 7Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta, okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha, ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.