Abụ Ọma 59:6
Psalms 59:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼanyasị, ha na-alaghachi, na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
Psalms 59:6 in English
Psalms 59:6 · Berean Standard Bible
They return in the evening, snarling like dogs and prowling around the city.
Context
4Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m.
Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m! 5Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile,
gị onye bụ Chineke nke Izrel,
kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ;
e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. Sela 6Nʼanyasị, ha na-alaghachi,
na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta
mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 7Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta,
okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha,
ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?” 8Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị;
ị na-akwa mba ndị a niile emo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.