Native Bible

Psalms 59:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị; ị na-akwa mba ndị a niile emo.

Psalms 59:8 in English

Psalms 59:8 · Berean Standard Bible

But You, O LORD, laugh at them; You scoff at all the nations.

Context

6Nʼanyasị, ha na-alaghachi, na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 7Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta, okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha, ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?” 8Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị; ị na-akwa mba ndị a niile emo. 9O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike. 10Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.