Abụ Ọma 59:9
Psalms 59:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike.
Psalms 59:9 in English
Psalms 59:9 · Berean Standard Bible
I will keep watch for You, O my strength, because You, O God, are my fortress.
Context
7Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta,
okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha,
ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?” 8Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị;
ị na-akwa mba ndị a niile emo. 9O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị;
gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike. 10Chineke m, onye m tụkwasịrị obi.
Chineke ga-ebutere m ụzọ
mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị. 11O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha,
ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu.
Were ike gị mee ka ha wagharịa,*
wedakwaa ha nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.