Native Bible

Psalms 59:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa,* wedakwaa ha nʼala.

Psalms 59:11 in English

Psalms 59:11 · Berean Standard Bible

Do not kill them, or my people will forget. Scatter them by Your power, and bring them down, O Lord, our shield.

Context

9O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike. 10Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị. 11O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa,* wedakwaa ha nʼala. 12Ka e jide ha nʼime nganga ha, nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, na nʼihi okwu ọnụ ha. Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha, 13jiri iwe ọkụ repịa ha, repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, na Chineke na-achị Jekọb.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.