Native Bible

Psalms 59:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

jiri iwe ọkụ repịa ha, repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, na Chineke na-achị Jekọb.

Psalms 59:13 in English

Psalms 59:13 · Berean Standard Bible

Consume them in wrath; consume them till they are no more, so it may be known to the ends of the earth that God rules over Jacob. Selah

Context

11O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa,* wedakwaa ha nʼala. 12Ka e jide ha nʼime nganga ha, nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, na nʼihi okwu ọnụ ha. Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha, 13jiri iwe ọkụ repịa ha, repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, na Chineke na-achị Jekọb. 14Nʼanyasị ha na-alaghachi; na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta, mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 15Ha na-awagharị na-achọ nri, na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.