Abụ Ọma 59:14
Psalms 59:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼanyasị ha na-alaghachi; na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta, mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo.
Psalms 59:14 in English
Psalms 59:14 · Berean Standard Bible
They return in the evening, snarling like dogs and prowling around the city.
Context
12Ka e jide ha nʼime nganga ha,
nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta,
na nʼihi okwu ọnụ ha.
Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha, 13jiri iwe ọkụ repịa ha,
repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ.
Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa,
na Chineke na-achị Jekọb. 14Nʼanyasị ha na-alaghachi;
na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta,
mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 15Ha na-awagharị na-achọ nri,
na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha. 16Ma aga m abụ abụ banyere ike gị,
nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị;
ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,
ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.