Abụ Ọma 59:15
Psalms 59:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-awagharị na-achọ nri, na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha.
Psalms 59:15 in English
Psalms 59:15 · Berean Standard Bible
They scavenge for food, and growl if they are not satisfied.
Context
13jiri iwe ọkụ repịa ha,
repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ.
Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa,
na Chineke na-achị Jekọb. 14Nʼanyasị ha na-alaghachi;
na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta,
mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 15Ha na-awagharị na-achọ nri,
na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha. 16Ma aga m abụ abụ banyere ike gị,
nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị;
ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,
ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. 17O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto;
gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,
Chineke m, onye m na-adabere.
59:11 Were ike gị hopu ha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.