Native Bible

Psalms 59:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị.

Psalms 59:10 in English

Psalms 59:10 · Berean Standard Bible

My God of loving devotion will come to meet me; God will let me stare down my foes.

Context

8Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị; ị na-akwa mba ndị a niile emo. 9O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike. 10Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị. 11O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa,* wedakwaa ha nʼala. 12Ka e jide ha nʼime nganga ha, nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, na nʼihi okwu ọnụ ha. Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.