Abụ Ọma 59:10
Psalms 59:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị.
Psalms 59:10 in English
Psalms 59:10 · Berean Standard Bible
My God of loving devotion will come to meet me; God will let me stare down my foes.
Context
8Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị;
ị na-akwa mba ndị a niile emo. 9O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị;
gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike. 10Chineke m, onye m tụkwasịrị obi.
Chineke ga-ebutere m ụzọ
mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị. 11O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha,
ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu.
Were ike gị mee ka ha wagharịa,*
wedakwaa ha nʼala. 12Ka e jide ha nʼime nganga ha,
nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta,
na nʼihi okwu ọnụ ha.
Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.