Native Bible

Psalms 55:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma akpọkuru m Chineke, Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m.

Psalms 55:16 in English

Psalms 55:16 · Berean Standard Bible

But I call to God, and the LORD saves me.

Context

14onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe. 15Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha. 16Ma akpọkuru m Chineke, Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m. 17Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị, ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya ma ọ na-anụkwa olu m. 18Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ, site nʼagha niile e busoro m, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.