Abụ Ọma 55:18
Psalms 55:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ, site nʼagha niile e busoro m, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.
Psalms 55:18 in English
Psalms 55:18 · Berean Standard Bible
He redeems my soul in peace from the battle waged against me, even though many oppose me.
Context
16Ma akpọkuru m Chineke,
Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m. 17Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị,
ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya
ma ọ na-anụkwa olu m. 18Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ,
site nʼagha niile e busoro m,
nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m. 19Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,
onye na-adịghị agbanwe,
ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ,
nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela 20Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,
ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.